Òkè anyị

Chineke nyere mmadụ ikike n'ụwa, mee anyị ndị nlekọta na-aza ajụjụ maka ihe onwunwe Ya. Nlekọta kwesịrị ntụkwasị obi, nrubeisi na ịtụkwasị Chineke obi na-eweta ngọzị, ma nnupụisi na ịdabere n'onwe onye na-eweta nsonaazụ.

Onyenwe anyị nyere mmadụ ikike n'ụwa

Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.” (Jenesis 1:28)
I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. (Abụ Ọma 8:6)
Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile. (Abụ Ọma 115:16)
Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya? Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze, dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya. (Ndị Hibru 2:6-8)

Ilu na-egosi Onyenwe anyị na-enye mmadụ ikike n'ihe onwunwe Ya

“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. (Matiu 25:14)

Ọnọdụ anyị bụ nke onye nlekọta

Ihe atụ nke ndị nlekọta

Ọ gwara onyeisi ndị ozi nʼụlọ ya, onye nke na-elekọta ihe niile o nwere sị ya, “Tinye aka gị nʼokpuru apata m. (Jenesis 24:2)
Josef hụtara amara nʼihu ya, ghọọ onyeozi nke aka ya. Pọtifa mere ya onye na-elekọta ezinaụlọ ya. Nyefee ya ihe niile o nwere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ha. Site nʼoge a, o mere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere, Onyenwe anyị gọziri ezinaụlọ onye Ijipt ahụ nʼihi Josef. Ngọzị Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼihe niile Pọtifa nwere, ma ihe o nwere nʼụlọ ma ndị o nwere nʼubi ya. Ya mere, ọ hapụrụ ihe niile o nwere nʼaka Josef. Nke a mere na ọ mazighị ihe ọzọ na-eme, ma ọ bụghị nri nke ọ na-eri. Josef nʼonwe ya mara mma ahụ dịkwa mma ile anya. (Jenesis 39:4-6)
Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.” Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya. O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.” (Jenesis 39:7-9)
A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka. (1 Ndị Kọrint 9:17)

Ndị nlekọta nwere ọrụ ụfọdụ

Mata na Onyenwe anyị nwe ihe onwunwe ma nyefee Ya ha

Ị ga-enyefe Onyenwe anyị ihe onwunwe gị ka ị bụrụ onye na-eso ụzọ

Nʼụzọ dị otu a, onye ọbụla na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. (Luk 14:33)

Ịhapụ ihe niile iji soro Onyenwe anyị na-eweta ngọzị

Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?” Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. (Matiu 19:27-29)
Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!” Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a, nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ. (Mak 10:28-30)
Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!” Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.” (Luk 18:28-30)

Ihe atụ nke ịhapụ ihe niile iji soro Onyenwe anyị

Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya. (Mak 1:20)
Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya. (Luk 5:11)
Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya. (Luk 5:27-28)

Ilu na-egosi ịhapụ ihe niile iji soro Onyenwe anyị

“Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ. “Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara. Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa. (Matiu 13:44-46)

Kwesị ntụkwasị obi

Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesiri ka ndị na-elekọta ihe ọbụla bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. (1 Ndị Kọrint 4:2)

Ngọzị nke ikwesị ntụkwasị obi

Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ. (Ilu 28:20)
Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya. “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya? Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a. (Matiu 24:44-46)

A gọziri ya na mmekọrịta chiri anya na Onyenwe anyị

“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ (Matiu 25:21)

A gọziri ya na ọrụ ka ukwuu

Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ “Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ (Matiu 25:20-23)
Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri? Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere. (Luk 12:42-44)
Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’ “Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’ “Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru. “Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’ “Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’ “Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’ “Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’ “Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’ “Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. (Luk 19:12-26)

A bụrụ ya ọnụ maka enweghị ntụkwasị obi

Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’ ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ. Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze. (Matiu 24:48-51)
“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya. Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma. “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ “Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ “Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị. Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’ “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri. “ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere. Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ (Matiu 25:14-30)
Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke. Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe. “Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike. (Luk 12:45-47)
Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’ “Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’ “Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru. “Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’ “Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’ “Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’ “Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’ “Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’ “Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. (Luk 19:12-26)

Ihe atụ nke onye nlekọta na-ekwesịghị ntụkwasị obi

Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu onyeisi ọrụ nke e boro ebubo na ọ na-ala akụ ya nʼiyi. Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’ “Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ. Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’ “Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’ “Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’ “Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè. (Luk 16:1-8)

Rube isi/chọọ Onyenwe anyị

Ngọzị nke nrubeisi/ịchọ Onyenwe anyị

Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha. Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu. (Diuteronomi 7:12-13)
Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu, ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị. (Diuteronomi 15:4-6)
Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu. Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere Onyenwe anyị Chineke gị isi. Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi. Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị. Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ. Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ. Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga. Onyenwe anyị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị. Onyenwe anyị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile. Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha Onyenwe anyị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu. Onyenwe anyị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị. Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla. Onyenwe anyị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru. Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe. (Diuteronomi 28:1-14)
Nʼihi ya, lezie anya idebe ụkpụrụ niile nke ọgbụgba ndụ a, ka ihe niile unu na-eme gaara unu nke ọma. (Diuteronomi 29:9)
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa Onyenwe anyị ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ. Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu. (Diuteronomi 30:9-10)
Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi. Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta. (Diuteronomi 30:15-16)
Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma. (Joshua 1:8)
Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị. (1 Ndị Eze 2:3)
Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba. (1 Ihe E Mere 22:12-13)
“Ya mere, ugbu a ana m enye unu iwu nʼihu ndị Izrel niile, na nʼihu ọgbakọ ndị nke Onyenwe anyị, na nʼihu Chineke anyị. Kpachapụnụ anya chọpụta ma debekwa iwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu, ka unu nwee ike nweta ezi ala nke a; ma nyefeekwa ya dịka ihe nketa nʼaka ụmụ ụmụ unu ruo ebighị ebi. (1 Ihe E Mere 28:8)
Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. (Abụ Ọma 37:4)
Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. (Abụ Ọma 128:1-2)

Ihe atụ nke nrubeisi na ngọzị

Ọ gbasoro Onyenwe anyị nʼụzọ niile. O sitekwaghị nʼụzọ Onyenwe anyị wezuga onwe ya. O debere ihe niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Onyenwe anyị nọnyeere ya nʼebe ọbụla ọ gara, ihe niile o mere gaara ya nke ọma. O nupuru isi jụ ịnọkwa nʼokpuru eze ndị Asịrịa, o fekwaghị ya ofufe. (2 Ndị Eze 18:6-7)
Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu. (2 Ihe E Mere 14:7)
Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu. (2 Ihe E Mere 26:5)
Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya. Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma. (2 Ihe E Mere 31:20-21)
Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!” Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara. (Aịzaya 30:22-23)

Ọbụbụ ọnụ nke nnupụisi/ịjụ ịchọ Onyenwe anyị

Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị. Ị ga-abụ onye a bụrụ ọnụ nʼobodo, bụrụ onye a bụrụ ọnụ nʼala ubi, Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ. Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ. Mba nke ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ ubi ị tara ahụhụ kụọ nʼala gị. Ị ga-abụ naanị onye a na-emegbu emegbu na onye a na-akpagbu ụbọchị ndụ gị niile. (Diuteronomi 28:15-18, 33)
Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị. Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma. Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi. Dịka mmụba ị mụbara nʼọnụọgụgụ, na ịdị ukwuu nke akụnụba gị si bụrụ ihe nyere Onyenwe anyị obi ụtọ, otu a ka ọ ga-esi tọkwaa ya ụtọ ibibi gị, na ime ka ị daa ụkpa. Ọ ga-esi nʼala ahụ ị na-aga inweta hopu gị. (Diuteronomi 28:45-48, 63)
Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi. Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta. Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha, agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta. (Diuteronomi 30:15-18)
Ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla jụrụ idebe iwu Chineke, na iwu eze, ga-abụ ọnwụ, maọbụ nchụpụ site nʼala ya gaa mba ọzọ, maọbụ ịnakọrọ ya ihe niile o nwere, maọbụ ịtụba ya nʼụlọ mkpọrọ.” (Ezra 7:26)

Ihe atụ nke nnupụisi na ọbụbụ ọnụ

Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe. Ya mere, Onyenwe anyị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide. (Ndị Ikpe 2:13-14)
Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda, kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị. Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere. Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha. Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ. (2 Ihe E Mere 21:12-14, 16, 17)
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ” (2 Ihe E Mere 24:20)
Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume. Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe. Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼalaeze nke aka ha na-ekpori ndụ, nke oke ịdị mma gị nke ị mere ka o rute ha aka, nʼala ọma ahụ sara mbara nwere ume i nyere ha, ha efeghị gị ofufe, ha esitekwaghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. “Ma lee, anyị bụ ndị ohu taa, e, anyị bụ ndị ohu nʼala ahụ i nyere nna nna anyị ha, ka ọ bụrụ ebe ha ga-esi rie mkpụrụ ọ mịpụtara na ihe ọma ọ na-amịpụta. (Nehemaya 9:33-36)
Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala. (Jeremaya 10:21)
Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko. Uwe ọma ahụ a kpara akpa ka i ji kpuchie ha. Mmanụ m na ụda m na-esi isi ụtọ ka ị chere nʼihu ha dịka onyinye. Ọzọkwa, ụtụ ọka ọma, mmanụ oliv na mmanụ aṅụ, nri ndị m nyere gị ka i rie, ka i ji chụọ aja na-esi isi ụtọ nʼihu ha. Otu a ka o si dị, ka Onyenwe anyị Onyenwe anyị kwupụtara. Aga m enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị hụrụ nʼanya, bụ ọtụtụ mba ahụ dị iche iche. Ha ga-ebibi gị, kwada ụlọ ịkwa iko gị, na ụlọ arụsị gị niile dị elu, gbaa gị ọtọ, narakwa gị uwe gị niile, na ihe ịchọ mma gị niile, hapụ gị ka ihere mee gị. (Izikiel 16:17-19, 39)
“Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?” Ugbu a, ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya. Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.” Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu. Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. “Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya. Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi. Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.” (Hegai 1:4-11)
“ ‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta. Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. (Hegai 2:15-17)

Tụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ bụghị onwe anyị ma ọ bụ ihe onwunwe

Ngọzị/ọganihu nye ndị tụkwasịrị Onyenwe anyị obi

Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 112:1, 3)
Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo. (Ilu 22:4)
Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu. (Ilu 28:25)

Nsonaazụ nke ịtụkwasị onwe anyị ma ọ bụ ihe onwunwe anyị obi

Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ. (Ilu 11:28)
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ. Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. (Jeremaya 17:5-6)
Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya. (Jeremaya 48:7)
Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu nke na-amị mkpụrụ hiri nne, gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya, gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’ Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu mee ka oke egwu bịakwasị gị,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya, “A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu. Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ. (Jeremaya 49:4-5)

Anyị ga-aza ajụjụ maka nlekọta anyị

“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. (Matiu 25:14, 19)
Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’ (Luk 16:2)
Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ. Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ. (2 Ndị Kọrint 5:9-10)
Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha. Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị. (Mkpughe 20:11-12)