A na-agba anyị ume ka anyị ghara inwe ụgwọ
Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ. (Ndị Rom 13:8)
E ji ụgwọ tụnyere ịbụ ohu
Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego. (Ilu 22:7)
Iwu ka a ghara ịbụ ohu ndị ọzọ
Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ. (1 Ndị Kọrint 7:23)
Ihe atụ nke nsogbu ụgwọ na-eweta
Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ. Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya. (1 Samuel 22:1-2)
Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.” (2 Ndị Eze 4:1)
Nʼoge ahụ, ụfọdụ ezinaụlọ bidoro itamu ntamu megide ndị Juu ibe ha. Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.” Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.” Ma ndị ọzọkwa na-asị, “Lee na anyị gbazitere ego anyị ji tụọ ụtụ isi eze maka ubi anyị na ubi vaịnị anyị. Nʼagbanyeghị na ọ bụ otu anụ ahụ na ọbara ka anyị na ndị Juu ọzọ nwere, dịka ụmụ ha dị ka ụmụ anyị dịkwa, ma anyị emeela ka ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom bụrụ ndị ohu. Ụfọdụ nʼime ụmụ anyị ndị inyom abụrụlarị ndị ohu, ma anyị enweghị ike nke aka anyị, nʼihi na ndị ọzọ bụ ndị nwezi ala ubi anyị na ubi vaịnị anyị niile.” (Nehemaya 5:1-5)
Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere, ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya. (Abụ Ọma 109:11)
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dị bụ nke m ji chụpụ ya? Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọ ka m resiri unu? Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu; nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu. (Aịzaya 50:1)
Ịbụ onye na-enweghị ụgwọ bụ ihe ọma
Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m. (Jeremaya 15:10)
E lere ụgwọ anya dị ka ọbụbụ ọnụ
Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị. Onye ọbịa bi nʼetiti gị ga-aba ụba karịa gị. Ihe ga na-agara ya nke ọma, ma ihe ga na-ajọrọ gị njọ. Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ. Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị. (Diuteronomi 28:15, 43-45)
E lere ịnọ n'enweghị ụgwọ anya dị ka ngọzị
Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu, ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị. (Diuteronomi 15:4-6)
Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu. Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere Onyenwe anyị Chineke gị isi. Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla. (Diuteronomi 28:1-2, 12)
Ịkwụ ụgwọ
Ndị na-atụ egwu Chineke na-akwụ ụgwọ ha
Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya. A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa. (Ilu 3:27-28)
Ndị ajọ omume anaghị akwụ ụgwọ ha
Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere. (Abụ Ọma 37:21)
Onyenwe anyị nwere ike n'ụzọ ebube inye ihe e ji apụ n'ụgwọ
Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.” Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?” Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.” Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole. Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ.” Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha. Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, “Butere m ite ọzọ.” Ma ọ zara, “O nweghị ite ọzọ fọdụrụ.” Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta. Ọ gara gwa onye nke Chineke ahụ, onye sịrị, “Gaa, ree mmanụ ahụ, kwụkwaa ụgwọ unu ji. Gị na ụmụ gị ndị ikom were nke fọdụrụ mee mkpa dịrị unu.” (2 Ndị Eze 4:1-7)
Mgbaghara ụgwọ n'afọ nke asaa ọ bụla – iwu nye ndị kwere ekwe nke Agba Ochie
Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị. Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola. Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị. Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu, ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị. Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya, ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ. Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara. Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya. A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ. (Diuteronomi 15:1-11)
Mgbe ahụ, Mosis nyere ha iwu sị, “Na ngwụcha afọ asaa ọbụla, nʼafọ ahụ a na-akagbu ụgwọ niile, nʼoge a na-eme Mmemme ụlọ Ikwu, mgbe Izrel niile ga-abịa nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta, ị ga-agụpụta ihe a site nʼakwụkwọ iwu a nʼihu mmadụ niile ka ha nụrụ ya. (Diuteronomi 31:10-11)
“Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ. (Nehemaya 10:31)
Ihe atụ ọzọ nke ịkwụ ụgwọ
Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị. Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị. (Fịlịmọn 18-19)
E ji ụgwọ mee ihe atụ na nkuzi
Nkuzi Jizọs Kraịst
Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?” Jisọs zara sị ya, “Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa. “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji. Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri. Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji. “Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’ Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ. “Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’ “Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’ “Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a. “Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’ Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji. “Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.” (Matiu 18:21-35)
Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.” “Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise. Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?” Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.” (Luk 7:40-43)
Nkuzi Pọl
...kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe. (Ndị Kọlọsị 2:14)
Ịgbara mmadụ akaebe n'ụgwọ (ịbụ onye mbịnye/ịkụ aka)
A naghị agba ume ịgbara mmadụ akaebe n'ụgwọ
Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ. (Ilu 17:18)
Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe. (Ilu 20:16)
Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe. E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe. (Ilu 27:13)
Ịgbara mmadụ akaebe n'ụgwọ dị ize ndụ
Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi. (Ilu 11:15)
Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji. Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị. (Ilu 22:26-27)
Ịpụ n'ịgbara mmadụ akaebe n'ụgwọ
Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe, ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya. Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla. Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra. Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya. (Ilu 6:1-5)