Ịrara Jizọs nye
Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja. Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. (Matiu 26:14-15)
Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.” Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ. Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.” Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa. Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa. Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya. Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.” (Matiu 27:3-10)
Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka. Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha. (Mak 14:10-11)
Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya. Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha. Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego. (Luk 22:3-5)
Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa. (Ọrụ Ndị Ozi 1:18)
Ụmụnna e rere ka ha bụrụ ohu
Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt. (Jenesis 37:28)
Ego a kwụrụ maka igba afa
Ndị ozi o zigara bụ ndị okenye obodo Moab na Midia. Ha ji ego ịjụta ase nʼaka ha. Mgbe ha ruru, ha ziri Belam ozi Balak ziri. (Ọnụọgụgụ 22:7)
Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu Onyenwe anyị bụ Chineke m. (Ọnụọgụgụ 22:18)
‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’? (Ọnụọgụgụ 24:13)
Ego e nyere iji gbaa mbọ ibibi ndị Juu
Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.” Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.” (Esta 3:9-11)
Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi. (Esta 4:7)
Ego a kwụrụ iji mebie Samsọn
Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek. Ndị eze ndị Filistia, bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.” (Ndị Ikpe 16:4-5)
Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha. (Ndị Ikpe 16:18)
Ego a kwụrụ maka igbu ọchụ
Ha sitere nʼụlọ arụsị Baal-Berit nye ya iri shekel ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya. (Ndị Ikpe 9:4)